Ndị uweojii Anambra ezigarala DPP akwụkwọ nnyocha gbasara ikpe nwaanyị e boro ebubo imetọ nwa ya

Ebe foto si, Anambra Police Command
Ndị uweojii na Anambra Steeti ezigarala ụlọọrụ Ọkaiwu ọha bụ 'Directorate of Public Prosecution (DPP) akwụkwọ nnyocha ha gbasara nwaanyị ahụ dị afọ 36 e boro ebubo imetọ nwa ya maka ndụmọdụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga kwupụtara nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzde, 24 Septemba 2026.
Cheta na ihe onyonyo gosiri mmetọ ụmụaka n'aka otu nwaanyị a kpọrọ Anulika Nwokike gbasara ebe niile n'ịntanetị na mbido Septemba.
Ikenga kwuru na ha emechaala nnyocha ha gbasara ebubo ahụ ma zigaa akwụkwọ nnyocha ikpe ahụ n'aka ngalaba DPP maka ime ihe kwesịrị ekwesị n'okpuru iwu.
O kwuru na nwaanyị ahụ ka nọ n'aka ndị uweojii dịka ikpe ya na-aga n'ihu.
Ikenga gbakwunyere na Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra bụ Nnanna Oji Ama, ekwela nkwa ihu na ndị uweojii ga na-echebe ụmụaka na ndị ọzọ nọ na nsogbu, mmegbu na ihe ike ndị ọzọ.
Amaghị m na nwunye m ji nwa m nwaanyị emepụta onyonyoo ndị gba ọtọ – Di nwaanyị a nwuchiri maka ebubo imetọ ụmụaka

Ebe foto si, Ministry of women affairs and social development, Anambra State/Facebook
Di Aṅulika Nwokike, bụ Ikechukwu Onyeanyusi, agọọla na ọ maghị na nwunye ya ji nwa ha nwaanyị emepụta ihe nkiri ndị gba ọtọ n'ịntanetị.
N'ihe onyonyoo e wepụtara n'akara Facebook nke Mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị na nlekọta obodo n'Anambra Steeti, n'ụbọchị Satọde, 12 Septemba 2026, Onyeanyusi kwuru na ọ tụrụ ya n'anya ma wute ya nke ukwuu maka ihe mere, ma kwuo na ya amaghị ihe nwunye ya na-eme.
O rịọrọ ọhanaeze na ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa ụmụaka ka ha nyere ụmụ ya aka ma gosi ha obi ebere ka ha na-agbake na mmetọ ahụ ha gabigara.
Kọmịshọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị na nlekọta obodo bụ Chinyere Esther Onyekesi kwere nkwa na ọchịchị Govanọ Chukwuma Charles Soludo agaghị anabata mmetọ maọbụ mmegbu ụmụaka.
Ọ kpọkukwara ndị mmadụ ka ha na-ekwupụta ngwangwa mgbe ha hụrụ maọbụ chọpụta na a na-emegbu nwata.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ndị uweojii anwuchiela nwaanyị dị afọ 36 maka ebubo iji ụmụaka eme ihe nkiri ndị gbaọtọ

Ebe foto si, Anambra State Police Command/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ na-asọ ntị oyi mere n'Onịcha dị n'Anambra steeti, ebe ndị uweojii Anambra steeti kwuru na ha anwuchiela otu nwaanyị dị afọ iri atọ na isii a na-enyo enyo maka ebubo metụtara imetọ ụmụaka site na igosi foto na onyonyo mmekọahụ ụmụaka a kpọrọ "Child Pornohraphy".
N'ozi ndị uweojii wepụtara n'akara soshal midịa ya nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga binyereaka, kọwara na ndị ọrụ ha hụtara onyonyo na-efesasị n'ịntanetị bụ nke gosiri ebe otu nwaanyị ji akụrụngwa mmekọahụ bụ 'sex toy' n'olu Bekee emetọ nwatakịrị.
Ikenga kọwara na ndị uweojii nwetara ozi na nwaanyị ahụ aha bụ Aṅụlika Onyeanusia ji akụrụngwa ịkwa iko nke bekee kpọrọ "sex toys" were emepụta ihe onyonyo ya ụmụaka n'eme.
Dịka Ikenga siri kwuo, ndị uweojii napụtakwara ụmụaka anọ nọ na-agbata afọ abụọ, atọ, isii na itoolu na ọtụtụ akụrụngwa e ji enwe mmekọahụ.
N'okwu ya, "Anyị ejidela nwaanyị ahụ ugbua. Anyị chere na e nwere ike ọ bụghị naani nwaanyị ahụ na-akpa ya bụ arụ. Anyị amalitela ime nnyocha ka anyị chọpụta ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ," ka Ikenga kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii jidekwara di nwaanyị iji gbaa ajụjụ ọnụ maka ha mata na ọ ma maka ihe ndị ahụ e boro nwunye ya ebubo na ọ na-eme.
N'okwu ya, kọmishọna ndị uweojii n'Anambra steeti bụ CP Nnanna Oji Amah gbarụrụ ihu maka akụkọ ọjọọ ahụ ma kwuo na akparamaagwa nwaanyị ahụ n'awụ akpata oyi n'ihi na ọ bụ iwu gbasara mmegbu ụmụaka ka o megidere.
Amah gara n'ihu nye ntuziaka ka e nye ụmụaka ndị azọpụtara n'aka nwaanyị ahụ ezi nchekwa na nleta anya zuru oke.
O kwuru na na ha na ndị otu gọọmenti na ndị ọzọ ọ dị n'aka, ga-ejikọ aka ọnụ ihụ na echekwara ụmụaka ahụ nke ọma ma hụkwa na ha nwetere ezi ndụmọdụ zuru oke bụ nke ga-enyere ha aka ịnata ọgwụgwọ.
Amah kwere nkwa na njirimara na ndụ nke onwe ụmụaka ndị ahụ ka abụ ihe ndị uweojii ga-echekwa mgbe nnoycha na ikpe ahụ na-aga n'ihu.
O kelekwara ndị mgbasa ozi 'Bloggers', ndị ọrụ nchekwa obodo na ndị agbata obi wetara mkpesa ahụ mere ndị uweoji jiri mata ihe na-eme.





























